-
Luk 11:7, 8Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 Onye ahụ esi n’ime ụlọ sị ya: ‘Enyezila m nsogbu. Akpọchiela m ụzọ, mụ na ụmụntakịrị m edinarakwala n’àkwà.* Enwekwaghị m ike ibili nye gị ihe ọ bụla.’ 8 Ana m asị unu, ọ bụrụgodị na ọ gaghị ebili nye ya ihe ọ bụla maka na ọ bụ enyi ya, ọ ga-ebili nye ya ihe ọ chọrọ maka na ọ nọgidesiri ike na-arịọ ya.+
-