-
Mak 14:13-16Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
13 O wee zipụ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya, sị ha: “Banyenụ n’ime obodo. Unu ga-ahụ otu nwoke bu udu mmiri. Soronụ ya.+ 14 N’ebe ọ bụla ọ banyere, sịnụ nna nwe ụlọ ahụ, ‘Onye Ozizi sịrị: “Olee ọnụ ụlọ ndị ọbịa ebe mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-anọ rie nri Ememme Ngabiga?”’ 15 Ọ ga-egosi unu nnukwu ọnụ ụlọ dị n’elu a kwadebere ma dozie. Kwadeberenụ anyị nri Ememme Ngabiga n’ebe ahụ.” 16 Ndị na-eso ụzọ ya gawara ma banye n’ime obodo ahụ. Ihe niile mekwara otú Jizọs gwara ha. Ha wee kwadebe maka Ememme Ngabiga.
-