24 Eze Asiria sikwa Babịlọn, Kuta, Ava, Hemat, na Sefaveyim+ kpọta ndị mmadụ, ka ha bichie n’obodo ndị dị na Sameria ndị Izrel bibu. Ha bịakwara weghara Sameria, birikwa n’obodo ndị dị na ya.
28 O wee sị ha: “O doro unu anya na onye Juu dara iwu ndị Juu ma ọ bụrụ na ya na onye mba ọzọ na-akpakọrịta ma ọ bụkwanụ na ọ bịara onye ahụ nso.+ Ma, Chineke gosiri m na e nweghị onye m kwesịrị ịsị na ọ rụrụ arụ ma ọ bụ na ọ dịghị ọcha.+