30 Enweghị m ike ime otu mkpụrụ ihe bụ́ uche m. Ọ bụ otú Nna m gwara m* ka m si ekpe ikpe. M na-ekpekwa ikpe ziri ezi+ n’ihi na ihe m na-achọ ime abụghị uche m, kama ọ bụ uche onye zitere m.+
28 Jizọs wee sị: “Ọ bụ mgbe unu wegoro Nwa nke mmadụ n’elu*+ ka unu ga-amata na ọ bụ m bụ ya,+ nakwa na e nweghị ihe ọ bụla m na-eme bụ́ uche m.+ Kama m na-ekwu ihe ndị a otú Nna m kụziiri m.