-
Matiu 14:19-21Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
19 O wee gwa ìgwè mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala n’ahịhịa. Ya ewerezie ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ ahụ, lelie anya n’eluigwe kpee ekpere.*+ Mgbe ọ nyawachara achịcha ndị ahụ, o nyere ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya enyewezie ha ìgwè mmadụ ahụ. 20 Ha niile wee rie, rijuo afọ. Ha atụtụkọta ihe ha rifọrọ, ya eju nkata iri na abụọ.+ 21 Ma ndị riri ya dị ihe dị ka puku ụmụ nwoke ise (5,000), ma e wezụga ụmụ nwaanyị na ụmụntakịrị.+
-
-
Mak 6:39-44Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
39 O wee gwa mmadụ niile ka ha nọdụ n’ìgwè n’ìgwè n’elu ahịhịa.+ 40 Ha wee nọdụ n’ìgwè n’ìgwè. Ụfọdụ dị otu narị mmadụ, ụfọdụ adịrị iri ise. 41 O weere ogbe achịcha ise ahụ na azụ̀ abụọ ahụ, lelie anya n’eluigwe ma gọzie ha.+ O wee nyawaa ogbe achịcha ndị ahụ malite inye ha ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-enye ìgwè mmadụ ahụ. O kekwaara mmadụ niile azụ̀ abụọ ahụ. 42 Ha niile wee rie, rijuo afọ. 43 Ha tụtụkọtara ibé achịcha ndị e rifọrọ erifọ, ya eju nkata iri na abụọ, n’agụnyeghị azụ̀ ha tụtụkọtara.+ 44 Ndị riri achịcha ahụ dị puku ụmụ nwoke ise (5,000).
-
-
Luk 9:14-17Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
14 N’eziokwu, ihe dị ka puku ụmụ nwoke ise nọ ebe ahụ. Ma ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Hazienụ ha n’ìgwè n’ìgwè, ka ha nọdụkwa ala, ihe dị ka mmadụ iri ise mmadụ iri ise.” 15 Ha wee hazie ha otú ahụ, ha niile anọdụkwa ala. 16 O wee were ogbe achịcha ise ahụ na azụ̀ abụọ ahụ, lelie anya n’eluigwe kpee ekpere.* O wee nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha nye ìgwè mmadụ ahụ. 17 Ha niile wee rie, rijuo afọ. Ha atụtụkọta ihe ha rifọrọ, ya eju nkata iri na abụọ.+
-