22 Ma, ebe ọ bụ na e meela ka unu kwụsị ịgbara mmehie ohu ma na-agbara Chineke ohu, mkpụrụ unu na-amị bụ ndụ dị nsọ unu na-ebi,+ ọ ga-emekwa ka unu nweta ndụ ebighị ebi.+
25 Ma onye na-enyocha iwu Chineke, nke zuru okè,+ nke na-eme ka mmadụ nwere onwe ya, onye na-emekwa ihe o kwuru, abụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ. Ọ bụ onye na-arụ ọrụ Chineke sị ka a rụọ. Ọ ga-enwekwa obi ụtọ ma ọ na-arụ ya.+