4 Olileanya a bụ inweta ndụ a na-enweghị ike ịla n’iyi, nke a na-emerụghị emerụ, nke na-anaghịkwa emebi emebi.+ E doweere unu ya n’eluigwe.+ 5 Chineke ji ike ya na-echebe unu maka na unu nwere okwukwe. Ọ na-echebe unu ka ọ zọpụta unu. A ga-eme ka a mata ihe niile gbasara nzọpụta a n’oge ikpeazụ.