-
Matiu 26:6-10Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
6 Mgbe Jizọs nọ na Betani, n’ụlọ Saịmọn onye ekpenta,+ 7 otu nwaanyị ji mkpọ̀ alabasta,* nke mmanụ na-esi ísì ọma dị n’ime ya, bịakwute ya. Mmanụ ahụ dịkwa oké ọnụ. Nwaanyị ahụ wee malite ịwụkwasị ya n’isi ya ka ọ nọ na-eri ihe. 8 Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ihe a, ha were iwe, sị: “Gịnị mere e ji laa mmanụ a n’iyi? 9 N’ihi na a gaara ereta ya ezigbo ego ma nye ya ndị ogbenye.” 10 Ebe Jizọs ma ihe ha na-ekwu, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-enye nwaanyị a nsogbu? O meere m ihe ọma.
-
-
Mak 14:3-6Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
3 Mgbe ọ nọ na-eri nri na Betani, n’ụlọ Saịmọn onye ekpenta, otu nwaanyị ji mkpọ̀ alabasta* nke mmanụ na-esi ísì ọma dị n’ime ya bịa. Mmanụ ahụ bụ ezigbo mmanụ nad,* ọ dịkwa oké ọnụ. Nwaanyị ahụ mepere mkpọ̀ mmanụ ahụ ma malite ịwụsa ya Jizọs n’isi.+ 4 Ụfọdụ ndị wee jiri iwe gwa ibe ha, sị: “Gịnị mere e ji laa mmanụ a na-esi ísì ọma n’iyi? 5 N’ihi na a gaara ere mmanụ a na-esi ísì ọma ihe karịrị narị mkpụrụ ego dinarịọs* atọ (300) ma nye ya ndị ogbenye.” Ha wesara nwaanyị ahụ ezigbo iwe.* 6 Ma Jizọs sịrị: “Hapụnụ ya. Gịnị mere unu ji na-enye ya nsogbu? O meere m ihe ọma.+
-