47 Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, ìgwè mmadụ bịara, nwoke ahụ a na-akpọ Judas, bụ́ otu n’ime ndịozi iri na abụọ ahụ, dukwa ha. O wee bịaruo Jizọs nso ka o susuo ya ọnụ.+
3 Judas wee kpọrọ ìgwè ndị agha na ndị nche bịa n’ebe ahụ. Ọ bụ ndị isi nchụàjà na ndị Farisii zitere ndị nche a. Ha ji ọwa ọkụ na mpanaka* na ngwá ọgụ bịa.+