13 Chineke Ebreham na nke Aịzik na nke Jekọb,+ ya bụ, Chineke nna nna anyị hà, emeela ka Jizọs,+ bụ́ Ohu ya, dị ebube,+ onye unu nyefere+ Paịlet, gọnahụkwa ya n’ihu ya, mgbe ọ chọrọ ịhapụ ya. 14 Unu gọnahụrụ onye nsọ na onye ezi omume. Unu kwukwara ka a hapụrụ unu otu nwoke, bụ́ ogbu mmadụ.+