35 Jizọs wee malite ijegharị n’obodo ukwu nakwa n’obodo nta niile, na-ezi ihe n’ụlọ nzukọ ha, na-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke ma na-agwọ ụdị ọrịa ọ bụla.+
8 Ma unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu.+ Unu ga-abụkwa ndị àmà m+ ma na Jeruselem+ ma na Judia na Sameria niile,+ ruokwa n’ebe kacha anya n’ụwa.”*+