30 Mgbe ya na ha nọ na-eri nri, o weere ogbe achịcha, gọzie ya, nyawaa ya, ma malite inye ha ya.+31 Mgbe ahụ ka ha matara onye ọ bụ. Ma, ọ pụrụ n’anya ha ozugbo.+
13 Jizọs bịara were achịcha ahụ nye ha, nyekwa ha azụ̀ ndị ahụ. 14 Nke a bụ nke ugboro atọ+ Jizọs pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ.