15 Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko ruo ụbọchị asaa.+ N’ụbọchị nke mbụ, unu ga-ewepụ ihe na-eko achịcha n’ụlọ unu, n’ihi na onye ọ bụla nke riri ihe e tinyere ihe na-eko achịcha, malite n’ụbọchị nke mbụ ruo n’ụbọchị nke asaa, a ga-egbu ya.*
15 Ị ga na-eme Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko.+ Ị ga-eri achịcha na-ekoghị eko ruo ụbọchị asaa otú m nyere gị n’iwu, n’oge a kara aka n’ọnwa Ebib,*+ n’ihi na ọ bụ n’oge ahụ ka i si n’Ijipt pụta. E nweghị onye ga-agba aka bịa n’ihu m.+