22 Paịlet wee sị ha: “Gịnịzi ka m ga-eme Jizọs, onye a sị na ọ bụ Kraịst?” Ha niile asị: “Kwụwa ya n’osisi!”*+23 O wee sị: “Maka gịnị? Olee ihe ọjọọ o mere?” Ma ha nọ na-etikwu mkpu, sị: “Kwụwa ya n’osisi!”+
15 Ma ha tiri mkpu, sị: “Kpọrọ ya pụọ! Kpọrọ ya pụọ! Kwụwa ya n’osisi!”* Paịlet sịrị ha: “Ọ̀ bụ m gbuo eze unu?” Ndị isi nchụàjà wee sị: “Anyị enweghị eze ọ bụla ma ọ́ bụghị Siza.”