8 N’afọ nke atọ n’ọchịchị Eze Belshaza,+ mụnwa bụ́ Daniel hụrụ ọhụụ ọzọ mgbe m hụchara ọhụụ ahụ m hụburu.+ 2 M nọ na Shushan+ bụ́ ebe obí eze dị, n’ógbè Ịlam,+ mgbe m nọ na-ahụ ihe na-eme n’ọhụụ ahụ. Mgbe m nọ na-ahụ ọhụụ ahụ, m nọ n’akụkụ ọwa mmiri dị na Yulaị.