9 Chineke gwakwara Ebreham, sị: “Gị na ụmụ* gị n’ọgbọ ha niile emebikwala ọgbụgba ndụ mụ na unu. 10 Ihe a bụ ndụ mụ na gị na-agba, nke gị na ụmụ* gị na-agaghị emebi: A ga-ebi nwoke ọ bụla n’ime unu úgwù.+
48 Ọ bụrụ na onye mbịarambịa bi n’ụlọ gị, ya achọọ imere Jehova Ememme Ngabiga, a ga-ebi ya na nwoke ọ bụla bi n’ụlọ ya úgwù. Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ ga-eme ememme a, ọ ga-adịzi ka nwa afọ. Ma, e nweghị nwoke a na-ebighị úgwù ga-eri ya.+
2 “Gwa ndị Izrel, sị, ‘Ọ bụrụ na nwaanyị adị ime ma mụọ nwa nwoke, nwaanyị ahụ ga-abụ onye na-adịghị ọcha ruo ụbọchị asaa, otú ọ na-abụ onye na-adịghị ọcha mgbe ọ na-ahụ nsọ ya.+3 N’ụbọchị nke asatọ, a ga-ebi nwa nwoke ahụ úgwù.+