23 Ìgwè mmadụ ahụ niile wee bilie kpụrụ Jizọs kpụgara Paịlet.+ 2 Ha wee malite ibo ya ebubo,+ sị: “Anyị chọpụtara na nwoke a na-eme ka ndị obodo anyị na-emegide ndị ọchịchị. Ọ na-asịkwa na e kwesịghị ịkwụ Siza ụtụ isi,+ nakwa na ya bụ Kraịst, bụ́ eze.”+