16Pọl mechara ruo Dabe nakwa Listra.+ E nwekwara otu onye na-eso ụzọ Jizọs nọ ebe ahụ, aha ya bụ Timoti.+ Nne ya bụ onye Juu, bụrụkwa onye na-eso ụzọ Jizọs, ma nna ya bụ onye Grik. 2 Ụmụnna nọ na Listra na Aịkoniọm na-ekwukwa okwu ọma banyere ya.
2 Anyị ziteere unu Timoti,+ nwanna anyị na onye ozi Chineke* nke na-ezisa ozi ọma banyere Kraịst, ka o mee ka unu kwụsie ike* ma kasie unu obi ka okwukwe unu sie ike,