-
1 Samuel 14:32, 33Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
32 Ma, anyaukwu mere ka ha jiri ọsọ na-ebukọrọ ihe ha kwatara n’agha. Ha kpụụrụ atụrụ na ehi na ụmụ ehi, gbuo ha n’ala nkịtị, rikọtakwa ha na ọbara ha.+ 33 A gakwara kọọrọ Sọl, sị: “Ndị Izrel emehiela Jehova. Ha na-erikọta anụ na ọbara ya.”+ Sọl wee sị: “Unu akpaala àgwà ka ndị na-enweghị okwukwe. Kwataranụ m otu nnukwu nkume ozugbo.”
-