20 Daniel sịrị:
“Ka e too aha Chineke ruo mgbe ebighị ebi,
N’ihi na ọ bụ naanị ya na-enye amamihe na ike.+
21 Ọ na-agbanwe oge na mgbe ihe ga-eme.+
Ọ na-ewepụ ndị eze, na-emekwa ka ndị eze malite ịchị.+
Ọ na-enye ndị ma ihe amamihe, na-emekwa ka ndị nwere ọgụgụ isi na-aghọta ihe.+