30 Ma, ọ bụ n’ihi ya ka unu na Kraịst Jizọs ji dị n’otu. Ọ bụ Jizọs mere ka anyị mata amamihe na ezi omume Chineke.+ Ọ bụkwa ya mere ka anyị dịrị nsọ.+ Ọnwụ ọ nwụrụ iji gbapụta anyị ga-emekwa ka anyị gharazie ịbụ ndị mmehie.+
9 Ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị ajọ omume niile+ n’ihi na ọ bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi, bụrụkwa onye ezi omume.