-
Ọrụ Ndịozi 17:26, 27Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
26 O sikwa n’otu mmadụ+ mee ka mmadụ niile nọ ná mba ọ bụla dịrị, meekwa ka ha biri n’elu ụwa niile.+ O kpebikwara oge ihe dị iche iche ga-eme nakwa ebe ụmụ mmadụ ga-ebi na ebe ha na-agaghị ebi.+ 27 N’ihi na Chineke chọrọ ka ndị mmadụ chọọ ya. Ọ bụrụkwa na ha agbaa mbọ chọọ ya, ha ga-achọta ya.+ N’eziokwu, ọ nọ onye ọ bụla n’ime anyị nso.
-