11 N’ihi ahụhụ niile ọ tara, ọ ga-ahụ uru ihe o mere bara. Ọ ga-ejukwa ya afọ.
Ohu m,+ bụ́ onye ezi omume, ga-eji ihe ọ ma
Mee ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị ezi omume.+
Ọ ga-eburukwa mmehie ha.+
12 N’ihi ya, m ga-ekenye ya na ọtụtụ ndị òkè.
Ya na ndị dike ga-ekekwa ihe a kwatara n’agha,
N’ihi na o kwere ka e gbuo ya.+
A gụnyekwara ya ná ndị na-emebi iwu.+
O buuru mmehie ọtụtụ ndị,+
Gbachitekwara ndị na-emebi iwu.+