20 N’ihi ya, e nweghị onye* a ga-akpọ onye ezi omume n’ihu ya maka na ọ na-eme ihe e kwuru n’iwu,+ n’ihi na ọ bụ iwu na-eme ka anyị mata ihe bụ́ mmehie.+
19 Gịnịzi mere e ji nye Iwu ahụ?* E nyere ya ka a mata ihe ọjọọ ndị mmadụ na-eme+ ruo mgbe nwa* ahụ ga-abịa,+ bụ́ onye e kwere nkwa ahụ. E nyere ya ndị mmụọ ozi,+ ha esi n’aka onye ogbugbo nyeruo ya.+