7 Ma, a ga-eme ka unu ndị a na-akpagbu na anyịnwa nwere onwe anyị mgbe a ga-esi n’eluigwe kpughee Onyenwe anyị Jizọs,+ ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike+8 n’ọkụ na-enwu enwu, mgbe ọ ga-abọ ọbọ n’isi ndị na-amaghị Chineke na ndị na-anaghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.+
16 Ha nọkwa na-asị ugwu na oké nkume ndị ahụ: “Dakwasịnụ anyị+ ma chebe anyị ka Chineke, onye nọ n’ocheeze ahụ, ghara ịhụ anyị,+ ka Nwa Atụrụ ahụ gharakwa iwesa anyị iwe ya,+17 n’ihi na oké ụbọchị ha ga-ewe iwe eruola,+ ònyekwa ka a ga-azọpụta?”*+
18 Ma mba niile were iwe, gịnwa eweekwa iwe, oge a kara aka eruo ka e kpee ndị nwụrụ anwụ ikpe, kwụọkwa ndị ohu gị bụ́ ndị amụma+ na ndị nsọ na ndị na-atụ egwu gị* ụgwọ,+ ma ndị nta ma ndị ukwu, bibiekwa ndị na-ebibi ụwa.”+