5 N’ihi ya, unu ekpela onye ọ bụla ikpe+ tupu oge a kara aka eruo, kama, cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị bịara. Ọ bụ ya ga-eme ka ihe ndị e zoro n’ọchịchịrị pụta ìhè, meekwa ka a mata ihe onye ọ bụla bu n’obi. Mgbe ahụkwa ka Chineke ga-aja onye ọ bụla mma otú kwesịịrị onye ahụ.+