3 Pọl kwuru na ya chọrọ ka Timoti soro ya na-aga ebe ndị ọ na-aga. Ọ kpọọrọ ya. Ma, o bu ụzọ bie ya úgwù n’ihi ndị Juu nọ ebe ndị ahụ,+ maka na ha niile ma na nna ya bụ onye Grik.
18 Ma, mgbe Pọl nọkwuru ọtụtụ ụbọchị ebe ahụ, ọ sịrị ụmụnna ka e mesịa ma banye ụgbọ mmiri ga-ebuga ya Siria. Prisila na Akwịla sokwa ya. Ọ kpụdara ntutu isi ya na Senkrea+ n’ihi na o nwere nkwa o kwere Chineke.