26 Ma unu ahụla, nụkwa otú Pọl si gwa ìgwè mmadụ okwu, meekwa ka ha kweta ihe o kwuru na chi ndị e ji aka mee abụghị chi.+ Ọ bụghị naanị n’Efesọs+ ka o mere ihe a, kama, ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ ná mpaghara Eshia niile.
8 N’ihi ya, ebe ọ bụ na anyị hụrụ unu n’anya nke ukwuu, anyị kpebisiri ike* na ihe anyị ga-eme abụghị naanị izi unu ozi ọma Chineke, kama na anyị ga-enye unu onwe* anyị+ maka na anyị hụrụ unu n’anya.+