15 N’ihi na ọ bụrụ na nri ị na-eri na-akpasu nwanna gị iwe, ị naghịzi egosi na ị hụrụ ya n’anya.+ Ekwela ka nri ị na-eri bibie nwanna gị, onye Kraịst nwụrụ maka ya.+ 16 N’ihi ya, unu emela ihe unu chere na ọ dị mma ma ọ bụrụ na ọ na-eme ka ndị mmadụ na-ekwu okwu ọjọọ gbasara unu.