21 N’ihi ya, Jehova Chineke mere ka oké ụra buru nwoke ahụ. Ka ọ nọ na-ehi ụra, Chineke wepụtara otu n’ime ọgịrịga ya ma mechie ebe o si wepụta ya. 22 Jehova Chineke wee jiri ọgịrịga ahụ o wepụtara n’ahụ́ nwoke ahụ kpụọ nwaanyị ma kpọtara ya nwoke ahụ.+