3 Ka ọ nọ na-aga Damaskọs, ya afọkwa obere ka o ruo, ìhè si n’eluigwe nwuo gburugburu ya na mberede,+ 4 ya adaa n’ala ma nụ olu na-agwa ya, sị: “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?” 5 Sọl wee sị ya: “Ị̀ bụkwanụ onye, Onyenwe m?” Ya asị ya: “Abụ m Jizọs,+ onye ị na-akpagbu.+