-
Ndị Hibru 5:12-14Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
12 N’eziokwu, unu ekwesịla ịbụ ndị na-akụziri ndị ọzọ ihe ugbu a, ma onye ọzọ ka ga-ebido n’isi kụziwere unu ihe ndị na-ataghị akpụ+ e dere n’okwu dị nsọ nke Chineke. Ọ bụzi mmiri ara ka a ga-enye unu, ọ bụghị nri siri ike. 13 N’ihi na onye nọgidere na-aṅụ mmiri ara amatabeghị okwu Chineke* n’ihi na ọ bụ nwatakịrị.+ 14 Ma nri siri ike bụ maka ndị tozuru etozu, ya bụ, ndị na-echebara ihe echiche nke ọma. Ha na-esi otú a azụ onwe ha* ka ha mata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ.
-