32 Unu na ha ma ọ bụ chi ha agbala ndụ.+33 Ha ekwesịghị ibi n’ala unu, ka ha ghara ime ka unu mehie m. Ọ bụrụ na unu efee chi ha, ọ ga-abụrụ unu ọnyà.”+
3 Unu na ha agọla ọgọ. Unu akpọrọla ụmụ unu ndị nwaanyị kpọnye ụmụ ha ndị nwoke. Unu alụtakwarala ụmụ unu ndị nwoke ụmụ ha ndị nwaanyị.+4 N’ihi na ha ga-eme ka ụmụ unu kwụsị ife m wee fewe chi ọzọ dị iche iche.+ Jehova ga-ewesazi unu oké iwe, ọ ga-ebibikwa unu n’egbughị oge.+
4 Mgbe Solomọn mere agadi,+ ndị nwunye ya mere ka o fewe chi ọzọ dị iche iche.+ O jighị obi ya niile fee Jehova bụ́ Chineke ya. O meghị ka Devid nna ya, onye ji obi ya niile fee Chineke.