16 Ka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na Chineke Nna anyị, onye hụrụ anyị n’anya,+ onye si n’amara ya kasie anyị obi ruo mgbe ebighị ebi ma mee ka anyị nwee ezigbo olileanya,+ 17 kasie unu obi ma mee ka unu kwụsie ike ka unu wee na-eme ihe ọma ma na-ekwu okwu ọma mgbe niile.