24 Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị niile na-agba ọsọ n’ọsọ ịsọ mpi na-agba ọsọ, ma naanị otu onye na-enweta ihe a na-enye onye meriri? Na-agbanụ ọsọ otú ga-eme ka unu merie.+
3 Na unu enweghị uche ọ̀ bụzi nke otú a? Ná mmalite, unu nọ na-eme ihe dị mmụọ Chineke mma. Ma ugbu a, ùnu na-agbalịzi ime ihe dị mmadụ mma ka unu nweta ihe unu na-achọ?+