6 ma naanị otu Chineke ka anyị nwere.+ Ọ bụ Nna,+ onye kere ihe niile, ndụ anyị dị bụkwa maka ya.+ Otu Onyenwe anyị dịkwa, ya bụ, Jizọs Kraịst, onye Chineke si n’aka ya mee ka ihe niile dịrị,+ anyị sikwa n’aka ya dịwa ndụ.
5 E nwekwara ozi dị iche iche a na-eje iji nyere ndị ọzọ aka,+ ma, ha niile bụ maka otu Onyenwe anyị. 6 E nwere ọtụtụ ụzọ Chineke si eji ndị mmadụ arụ ọrụ dị iche iche, ma, ọ bụ otu Chineke na-eme ka ha na-arụ ha niile.+