22 Mmadụ niile nọ ebe ahụ wee jiri iwe gwa ha okwu. Ndị isi obodo ahụ dọkara uwe ha yi, kwuokwa ka a pịa ha ụtarị.+23 Mgbe ha tikachara ha ahụ́, ha kpọchiri ha n’ụlọ mkpọrọ, gwakwa onye na-elekọta ụlọ mkpọrọ ka o chee ha nche ka ha ghara ịgbapụ.+
2 N’ihi na unu ma na n’agbanyeghị na anyị bu ụzọ taa ahụhụ na Filipaị,+ a kparịakwa anyị, Chineke nyeere anyị aka, anyị akata obi* zie unu ozi ọma Chineke+ n’agbanyeghị na a nọ na-akpagbu anyị nke ukwuu.