29 Ihe a mere ka obodo ahụ niile na-agba aghara. Ha jikwa otu obi kworo gaa dọkpụrụ Gayọs na Arịstakọs+ banye n’ebe a na-eme ihe nkiri. Ha abụọ bụ ndị Masedonia na-eso Pọl ejegharị.
4 Ndị so ya bụ Sọpata nwa Pirọs onye Beria, Arịstakọs+ na Sekọndọs, bụ́ ndị Tesalonaịka, Gayọs onye Dabe, Timoti,+ nakwa Tikikọs+ na Trọfimọs,+ bụ́ ndị si ná mpaghara Eshia.
2 Anyị banyere n’otu ụgbọ mmiri nke si Adramitiọm, nke chọrọ ịga n’ọdụ ụgbọ mmiri ndị dị n’ụsọ osimiri ná mpaghara Eshia, ụgbọ mmiri ahụ eburu anyị gawa. Arịstakọs,+ onye Tesalonaịka nke dị na Masedonia, sokwa anyị.