1 Abụ m Pọl, onye a tụrụ mkpọrọ+ n’ihi Kraịst Jizọs. Mụ na Timoti,+ bụ́ nwanna anyị, na-edetara Faịlimọn, onye anyị hụrụ n’anya na onye ọrụ ibe anyị, akwụkwọ ozi, 2 ya na Afia, nwanna anyị nwaanyị, na Akịpọs,+ onye agha ibe anyị, nakwa ọgbakọ dị n’ụlọ+ Faịlimọn: