19 Nke a pụtara na Chineke si n’aka Kraịst na-eme ka ya na ndị mmadụ dị ná mma,+ ọ naghịkwa agụkọrọ ha mmehie ha.+ O ziekwala anyị ka anyị na-agwa ndị mmadụ ihe ha ga-eme ka ya na ha dị ná mma.+
10 ka e nwee otú a ga-esi na-elekọta ihe. Ihe a ga-emekwa mgbe oge ọ kara aka zuru, ka o wee chịkọta ihe niile dị n’eluigwe na ihe niile dị n’ụwa, ka ha nọrọ n’okpuru Kraịst.+ N’eziokwu, a ga-achịkọta ihe niile n’okpuru onye