25 N’ihi ya, ebe unu hapụrụla aghụghọ, ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu,+ n’ihi na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu ahụ́.+
8 Ma ndị ụjọ na ndị na-enweghị okwukwe+ na ndị na-adịghị ọcha na ndị rụrụ arụ na ndị na-egbu mmadụ*+ na ndị na-akwa iko*+ na ndị na-eme mgbaasị na ndị na-ekpere arụsị na ndị ụgha niile,+ a ga-atụba ha n’ọdọ ọkụ ahụ sọlfọ na-eme ka ọ na-enwusi ike.+ Ọ pụtara ọnwụ nke abụọ.”+