6 Unu na-eme ka anyị,+ na-emekwa ka Onyenwe anyị,+ ebe ọ bụ na unu ji ọṅụ, nke mmụọ nsọ na-eme ka mmadụ nwee, nabata okwu Chineke n’agbanyeghị na a kpagbusiri unu ike.+
14 Ụmụnna anyị, unu na-eṅomi ọgbakọ Chineke ndị dị na Judia bụ́ ndị ha na Kraịst Jizọs dị n’otu, n’ihi na unu tara ahụhụ n’aka ndị obodo unu+ otú hanwa na-atakwa ahụhụ n’aka ndị Juu,
21 N’eziokwu, Chineke họọrọ unu ka unu na-eme otú a, n’ihi na Kraịst n’onwe ya tara ahụhụ maka unu.+ O gosiri unu ihe unu ga na-eme ka unu na-esosi nzọụkwụ ya ike.*+