16Pọl mechara ruo Dabe nakwa Listra.+ E nwekwara otu onye na-eso ụzọ Jizọs nọ ebe ahụ, aha ya bụ Timoti.+ Nne ya bụ onye Juu, bụrụkwa onye na-eso ụzọ Jizọs, ma nna ya bụ onye Grik. 2 Ụmụnna nọ na Listra na Aịkoniọm na-ekwukwa okwu ọma banyere ya.
19 Enwere m olileanya na m ga-ezitere unu Timoti+ n’oge na-adịghị anya ma ọ bụrụ uche Onyenwe anyị Jizọs, ka e wee gbaa m ume mgbe m ga-anụ gbasara unu. 20 N’ihi na enweghị m onye ọzọ nwere ụdị obi o nwere, onye ga-eji obi ya niile lebara mkpa unu anya.