-
Ọrụ Ndịozi 2:29-32Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
29 “Ụmụnna m, biko, ka m gwa unu hoo haa gbasara nna nna anyị Devid. Ọ nwụrụ, e liekwa ya,+ ili ya dịkwa n’obodo anyị ruo taa. 30 Ọ bụ onye amụma. Ọ makwa na Chineke ṅụụrụ ya iyi na ọ ga-eme ka otu n’ime ụmụ ya* nọdụ ala n’ocheeze ya.+ 31 Ọ ma na a ga-akpọlite Kraịst n’ọnwụ nakwa na a gaghị ahapụ ya n’ili,* anụ ahụ́ ya agaghịkwa ere ure.+ 32 Chineke kpọlitere Jizọs a n’ọnwụ, anyị hụkwara ya.+
-