10 “Ha ga-eji osisi akeshịa rụọ igbe nke ga-adị kubit abụọ na ọkara n’ogologo, otu kubit na ọkara n’obosara, nakwa otu kubit na ọkara n’ịdị elu.+ 11 Ị ga-ejizi ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya.+ Ị ga-amachi ya ime na azụ, ị ga-ejikwa ọlaedo kpụọ ihe ịchọ mma gburugburu ọnụ ya.+