-
Jenesis 27:27-29Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
27 Ọ bịara nso susuo ya ọnụ, ya anụ ísìsì uwe ya.+ O wee gọzie ya, sị:
“Lee, ísìsì nwa m dị ka ísìsì nke ọhịa Jehova gọziri agọzi. 28 Ka ezi Chineke nye gị igirigi nke eluigwe+ nakwa ala nke na-eme nri,+ ka o nyekwa gị ọka* na mmanya ọhụrụ n’ụba.+ 29 Ka ndị dị iche iche jeere gị ozi, ka mba dị iche iche kpọọkwara gị isiala. Bụrụ onyeisi ụmụnne gị, ka ụmụnne gị kpọọkwara gị isiala.+ Ka onye ọ bụla bụrụ gị ọnụ bụrụ onye a bụrụ ọnụ, ka onye ọ bụla gọziri gị bụrụkwa onye a gọziri agọzi.”+
-