-
Daniel 3:23-25Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
23 Ma ụmụ nwoke atọ a, ya bụ, Shedrak, Mishak, na Abednego, bu agbụ e kere ha daba ná nnukwu ọkụ ahụ.
24 Ụjọ jideziri Eze Nebukadneza, ya ebilie n’ike jụọ ndị ọkwá ha gbagotere ná ndị na-ejere ya ozi, sị: “Ọ́ bụghị ụmụ nwoke atọ ka anyị kere agbụ tụba n’ime ọkụ?” Ha zara eze, sị: “Eze, ọ bụ mmadụ atọ.” 25 Ọ sịrị: “Lee, m na-ahụ ụmụ nwoke anọ ka ha na-ejegharị n’ime ọkụ ahụ, e nweghịkwa ihe ọ bụla na-eme ha. Onye nke mere ha anọ yiri chi.”
-