15 Mgbe onye na-ejere onye nke ezi Chineke ozi biliri n’isi ụtụtụ pụta n’èzí, ọ hụrụ ìgwè ndị agha ji ịnyịnya na ụgbọ agha gbaa obodo ahụ gburugburu. Ya asị Ịlaịsha ozugbo: “Ewoo, nna m ukwu! Gịnị ka anyị ga-eme?” 16 Ma ọ sịrị: “Atụla egwu,+ n’ihi na ndị anyị na ha nọ karịrị ndị ha na ha nọ.”+