1 Timoti 5:17 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 17 E kwesịrị ịna-akwanyere ndị okenye na-arụ ọrụ ha nke ọma+ ùgwù okpukpu abụọ,+ karịchaa, ndị na-agbasi mbọ ike n’ikwu okwu na n’ịkụzi ihe.+ Ndị Hibru 13:17 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 17 Na-eruberenụ ndị na-eduzi unu isi,+ na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha,+ n’ihi na ha na-eche unu* nche ebe ọ bụ na ha ga-aza Chineke ajụjụ.+ Ime otú a ga-eme ka ha jiri ọṅụ na-arụ ọrụ a ma ghara ịna-ama ọsụ, n’ihi na ọ ga-emebiri unu ihe.
17 E kwesịrị ịna-akwanyere ndị okenye na-arụ ọrụ ha nke ọma+ ùgwù okpukpu abụọ,+ karịchaa, ndị na-agbasi mbọ ike n’ikwu okwu na n’ịkụzi ihe.+
17 Na-eruberenụ ndị na-eduzi unu isi,+ na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha,+ n’ihi na ha na-eche unu* nche ebe ọ bụ na ha ga-aza Chineke ajụjụ.+ Ime otú a ga-eme ka ha jiri ọṅụ na-arụ ọrụ a ma ghara ịna-ama ọsụ, n’ihi na ọ ga-emebiri unu ihe.