7 Wepụnụ ihe ahụ na-eko achịcha, ka unu wee bụrụ ntụ ọka ọhụrụ a gwakọtara agwakọta, n’ihi na unu dị ka ntụ ọka a na-etinyeghị ihe na-eko achịcha. N’eziokwu, Kraịst ejirila ndụ ya chụọ àjà,+ si otú ahụ bụrụ nwa atụrụ anyị ji mee Ememme Ngabiga.+
4 Ndị na-akwa iko,* ọ̀ bụ na unu amaghị na mmadụ bụrụ enyi ụwa, ọ ghọọla onye iro Chineke? N’ihi ya, onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ enyi ụwa na-eme onwe ya onye iro Chineke.+
4 Anụkwara m ka olu ọzọ si n’eluigwe sị: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta,+ ma ọ bụrụ na unu achọghị iso ya mehie, ọ bụrụkwa na unu achọghị ka a taa unu ahụhụ a ga-ata ya.+